Isaiah 57

1Ndị ezi omume na-ala nʼiyi,
ma ọ dịghị onye ọbụla na-etinye ya nʼobi;
a na-ewezuga ndị ji obi ha niile na-efe Chineke,
ma ọ dịghị onye na-aghọta,
na-ewezugara onye ezi omume
pụọ nʼihu ihe ọjọọ.
2Ndị na-agazi agazi nʼụzọ ha
na-abanye nʼudo.
Ha na-enwekwa izuike mgbe ha dinara nʼọnwụ.

3“Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị,
unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna.
4Onye ka unu na-akwa emo?
Onye ka unu na-akọcha,
na-arapụtakwara ire unu?
Unu ọ bụghị ụmụ ndị nnupu isi,
mkpụrụ ndị na-ekwu okwu ụgha?
5Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụ
mgbe unu zukọrọ na-efe arụsị unu nʼokpuru osisi ook ọbụla.
Unu na-ewerekwa ụmụ unu chụọ aja
na ndagwurugwu niile, na nʼokpuru nkume niile dị elu.
6Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ,
Nkume ndị a na-akwọ mụrụmụrụ bụ ihe ha ji ejere chi ndị ahụ na-abụghị chi ozi.

nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere.
E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niile
na onyinye mkpụrụ ọka unu niile.
Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu?
7Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina,
nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu.
8Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile,
ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị.
Ị gbakụtara m azụ,
yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị,
ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ,
imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ.
9Ị were mmanụ jekwuru Molek
Maọbụ, eze

meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba.
Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị
Ya bụ, arụsị apịrị apị
gaa na mba dị anya;
ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ.
10Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị,
ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’
Ị chọtara ntute nye ndụ gị,
ya mere, na ị daghị mba.

11“Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a?
Nke mere na ị dịghị agwa m eziokwu?
Ị naghị echetakwa m,
ị naghị atụgharịkwa ihe banyere m nʼobi gị?
Ọ bụ nʼihi na m gbara nkịtị oge ndị a niile
ka i ji hapụ ịtụ m egwu?
12Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị,
igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka.
13Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka,
ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị.
Ikuku ga-eburu ha niile bufuo,
naanị otu nkuume ga-ekutu ha.
Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụ
ga-eketa ala ahụ;
ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m.”

Nkasiobi dịrị ndị dị umeala nʼobi

14A ga-asịkwa,

“Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma.
Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m.”
15Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu,
onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru:
“Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ,
ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala,
itute mmụọ nke onye e wedara nʼala,
na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.
16Nʼihi na ọ bụghị ruo ebighị ebi ka m ga na-emegide gị,
maọbụ na-egosi iwe m.
Ọ bụrụ na m emee otu a, mmụọ ndị mmadụ ụwa niile ga-ada mba,
ya na mkpụrụobi niile ahụ m ji aka m kpụọ.
17Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha.
Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ji taa ha ahụhụ, gbakụtakwa ha azụ.
Ma lee, ha nọgidesikwara ike na-eme mmehie, na-eme ihe ọbụla nke na-atọ obi ha ụtọ.
18Ahụla m ihe niile ha mere ma aga m agwọ ha.
Aga m edu ha, kasịekwa ndị na-eru ụjụ nʼIzrel obi.
19Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha.
Udo, udo, dịrị ndị nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anya,”
ka Onyenwe anyị kwuru.
“Aga m agwọkwa ha.”
20Ma ndị niile na-emebi iwu dị ka oke osimiri na-amagharị amagharị,
nke na-adịghị ezu ike mgbe ọbụla.
Ọ na-amapụtakwa ụrọ na apịtị.
21“Ọ dịkwaghị udo dịrị onye na-emebi iwu,” ka Chineke kwuru.
Copyright information for IboBIU